Views: 103
Ụmụafọ Igbo bi na Naịjirịa nakwa mbaụwa niile nọ n’ihe iru uju dịka a na-eme olili Emmanuel Iwuanyanwu, Onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ otu jikọtara ndị Igbo niile n’ụwa.
Iwuanyanwụ nwụrụ n’otu ụlọọgwụ dị n’Abuja n’ọnwa Julaị afọ 2024 dịka ọ gbachara afọ iri asatọ na abụọ (82yrs).
Ozu Iwuanyanwụ wuchiri na steeti ya bụ Imo n’ụbọchị 29 Ọktoba dịka a malitere emume akwamozu ya n’Owerri bụ Isiobodo steeti ahụ.
Lee ka ụka nkwanye ugwu e meere Emmanuel Iwuanyanwu si ga n’Enugwunkeji 24 gara aga
Emmanuel Iwuanyanwu: Ọ bụ isi kara aka ga-ebuli okiti nke Ohaneze Ndigbo17 Mee 2023
Ọ bụ gịnị na-esere ndị nna na ndị ntorobịa Ọhanaeze Ndigbo?9 Ọgọọst 2024
Ọtụtụ ndị ndu mpaghara Ọwụwa Anyanwụ gụnyere ndị gọvanọ, mịnịsta, ndị omeiwu wuchiri n’obodo Ikeduru iji kwanyere Iwuanyanwu ugwu ikpeazụ n’olili ya.
Odeakwụkwọ Gọọmentị etiti bụ George Akume, Mịnịsta nta na-ahụ maka akụnaụba bụ Doris Anite Uzoka nakwa ndị ọzọ bịakwara olili ahụ.
Ebe foto si, Enugu State Government
Ofufe nkwanye ugwu e meere ya n’ụlọụka dị n’Enugwu
Ebe foto si, Enugu State Government
E doro ụka iji kwanyere Emmanuel Iwuanyanwu ugwu nke ikpeazu n’ụlọụka dị n’Enugwu Steeti.
E mere nke a n’Enugwu maka na ọ bụ ebe isiụlọọrụ otu Ohanaeze Ndigbo dị.
Iwuanyanwu nwụrụ n’ọnwa July afọ a ka ọ rịachara ọrịa obere oge.
E mekwara ọtụtụ emume ndị ọzọ n’ụbọchị dị iche iche tupu ozu ya abanye n’ala na Fraịde ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba 2024.
Ebe foto si, Enugu State Government
Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu dịka Gọvanọ Enugwu Steeti, Peter Mba, Osote Gọvanọ Imo steeti, Chinyere Ekomaru, Sịnetọ Victor Umeh, Sịnetọ Uche Ekwunife, Gọvanọ chiburu Ebonyi steeti bụ Sam Egwu nakwa nwunye Onyeisiala Naịjirịa nke mbụ bụ Ọkammụta Uche Azikiwe na ndị ọzọ bịara ụka ahụ.
Gọvanọ Peter Mbah kọwara Emmanuel Iwuanyanwu dịka “oke osisi gbara mbọ maka iwete udo n’etiti agbụrụ dị icheiche na Naịjirịa”.
Ụmụada Igbo bịara emume nkwanyere Iwuanyanwu ugwu ikpeazụ